africa

Fr. Mbaka atụgharịala duru ndị nsonso ya na ngagharịudo ikwado Bishop Onaga


Aha onyonyo,

Fr. Mbaka atụgharịala duru ndị nsonso ya na ngagharịudo ikwado Bishop Onaga

Fada Mbaka na ndị nsonso ya mere ngagharịudo a iji gosi nkwado ha n’ebe bịshọpụ Enugwu Dayọsis bụ Bishọp Callistus Onaga, nọ.

Ntụgharị a na-abịa dịka ndị nsonso Adoration Ministry Enugwu, bụ ụlọụka Fada Mbaka, mechara ngagharịiwe n’ụbọchị ụka, ebe ụfọdụ n’ime ha nọ na-ekwu sị “Onaga ga-apụrịrị”.

Ebe foto si, Adoration Ministry Enugu Nigeria/Facebook

Fada Mbaka n’ụbọchị Wenezde, 22 nke ọnwa Juun afọ 2022, duuru ndị nsonso ya bịara n’ụlọụka Adoration, na-agwa ha ka ha laghachị n’ụlọ ha n’ihi na ha ekwesịghị ịka ụka ụbọchị ahụ.

Ọ gwara ha sị na ọ chọghị ka onye ọbụla kparịa Bishọp Onaga ọzo, na ọ chọrọ ka onye obula na-ekwu naanị ihe ọma gbasara Bishọp.

O kwuru sị na ọ ka bụkwa ụkọchukwu ụka Katọlik, nke bụ na ọ gaghị nupuru bishọpụ ya isi.

O kwuru sị “Ịkparị Bishọpụ m bụ ịkparị m…na-ekpere anyị ekpere, kpeere m ekpere, kpeere Bịshọpụ ekpere.

“Kpeere Peter Obi ekpere. Ọ bụ nwanne anyị. Ọ bụ nwa anyị.

“Ka anyị chebiri ihe ụka ga-agwa anyị mee. Anyị agaghị agbakọzị ebe a (Adoration ground) ruo mgbe e kpebiri.

“Unu akparịzịla Bishọpụ na soshal midia. Anyị na Bishọpụ anyị enweghi nsogbu.”

Ọ malitere ịgụpụta ihe ndị mmadụ dere n’akwụkwọ ha ji eme ngagharịudo, nke gosiri ihe ọma dị iche iche ha dere maka Bishọp. Cheta na e dechara okwu ọjọọ na ndị nke ha ji mee ngagharịiwe mbụ.

Ndị Adoration ji ohere ahụ na-arịọ Bishọp Onaga arịrịọ mghaghara maka ngagharịiwe ha mere, ma rịọ ya ka ọ hapụkwa ka ụka Adoration malitekwa ọzọ.



READ SOURCE

This website uses cookies. By continuing to use this site, you accept our use of cookies.  Learn more