africa

Fr Ejike Mbaka : Ụka Katọlịk anapụla Fada Ejike Mbaka ikike ịbụ oji-ji-jide-mma Adoration ministry’


Rev Fr Ejike Mbaka

Ebe foto si, Adoration Ministry Enugu

Ụka Katọlịk na Dayosis Enugwu anapụla Fada Ejike Mbaka ‘Adoration Ministry’ o hibere tinye ya n’okpuru dayọsis.

A machikwara ya itinye ọnụ n’okwu metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị.

Nke a na-abịa ka ọ nọchara nkwụsị ọrụ nke Bishop dayosis ahụ bụ Calistus Onaga kwụsiburu ya abalị 30 maka mee ‘ekpere” ọpịpa nakwa ntụgharịuche’.

N’ozi nke nnukwu ụkọchukwu na-elekọta dayọsis ahụ bụ Bishọpụ Calistus Onaga zigara Mbaka, n’abalị atọ nke ọnwa Juun, ọ sịrị, “Adoration Ministry Enugu ga-abụzị ‘Chaplaincy’ nke ga-anọ n’okpuru Dayọsịs Enugwu nke Fada Mbaka ga-abụ onye ndu ya.”

Aha onyonyo,

Father Ejike Mbaka na ihe ndị ị maghị maka ya

Dịka ọnụ na-ekwuru dayosis ahụ bụ Fada Benjamin Achi siri kọwaa, “A ga-ebidokwa kuziwe nkuzi katikizim dịka ndị Katọlik na-akụzị.”

“Ọ gaghị anọzi dịka ministri dịka ọ dị na-mbụ, a ga-enwezi a kpọrọ “chaplaincy council bụ ndị isi ga na-ahazi ihe a na-eme.”

“Onye ọbụla na abụghị Katolik agaghị enwe ọkwa pụtara ihe n’a chaplaincy.”

Ebe foto si, Enugu Catholic Diocese

Fada Achi kọwara na Fada Mbaka ka ga-abụ ‘Chaplain’ nke ‘chaplaincy’ ahụ mana a ga-etinyere ya ndị ụkọchukwu ndị ọzọ ya na ya ga na-arụkọ ọrụ.

Ebe foto si, Enugu Catholic Diocese



READ SOURCE

Leave a Reply

This website uses cookies. By continuing to use this site, you accept our use of cookies.  Learn more