africa

Dowen College Student Death: Taa kwesiri ịbu ụbọchị ncheta ọmụmụ nwa m – Nna nwata akwụkwọ nwụrụ


Sylvester Oromoni

Ebe foto si, Perrison Oromoni

Maazị Sylvester Oromoni bụ nna Sylvester Oromoni bụbu nwata akwụkwọ ụlọakwụkwọ Dowen kwuru na ụbọchi anọ nke ọnwa Decemba kwesiri ịbụ ụbọchi ncheta ọmụmụ nwata ahụ.

Maazị Oromoni kwuru nke a dịka aka na-achị Delta Steeti bụ Ifeanyi Okowa kpọrọ ya iji kasie ya obi maka ọnwụ nwa ya.

Nke a na-abịka dịka onyeisi ndị uweojii na Legọs Steeti bụ Hakeem Odumosu kwuru na ndị otu ya ga-enyocha ma chọpụta ihe mere Sylvester Oromoni bụ nwata akwụkwọ ulọakwụkwọ Dowen tupu ọ nwụọ.

Onyeisi ndi uweojii gwara BBC Pidgin n’ubọchị Fraịde na ha agaghị egbo oge ịnwụchị ma ịkpụpụ ndị aka ha dị n’ọnwa nwatakịrị a dị afọ 12 ụlọikpe.

Maazị Odumosu si na ihe dị mkpa ugbua bụ ime nnyocha chọpụta mata ihe mere.

Nke na-abịa dịka ndị gọọmentị steeti ahụ mechiri ya bụ ụlọakwụkwọ maka ihe mere.

Gọọmentị Legọs emechiela ụlọakwụkwọ Dowen College.

Ganiu Lawal bụ ọnụ na-ekwuru Mịnịstrị agụmakwụkwọ nke Legọs kwuru nke a n’ụbọchị Fraịde.

Nke a na-abịa dịka nwata akwụkwọ gbara afọ iri na abụọ aha ya bụ Sylvester Oromoni.

Akụkwọ kwuru na Sylvester Oromoni nwụrụ oge ụmụakwụkwọ ibe ya tiri ya ihe tinka tiri pan, n’ihi na ọ jụrụ isonye ha n’otu nzuzo.

Gịnị mere kpọmkwem?

Ebe foto si, Sylvester Oromoni

Ndị isi ụlọ akwụkwọ Dowen College kwuru na ọ bụ ebe Sylvester Oromoni na-agba bọọlụ ka ọ nọrọ merụọ ahụ, nke butere ọnwụ ya.

Mana nna nwata ahụ, aha ya bụkwa Sylvester Oromoni, kwuru na akụkọ ahụ bụ ụgha.

Mazi Oromoni kwuru na nwa ya gwara ya tupu ọ nwụọ na ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe ya tiri ya ihe ma merụọ ya ahụ.

Oromoni kwuru sị: “Nwa m gwara m na ọ bụ mmadụ ise batara n’ime ụlọ ebe ha bi, gbanyụọ ọkụ, ma malite iti ya ihe.”

“Ụmụakwụkwọ ndị ọzọ nọ ebe ahụ oge ya bụ ihe mere.”

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto,

Sylvester Oromoni bụ nna nwata akwụkwọ ahụ nwụrụ anwụ

Mazi Oromoni kwuru na ọ bụ maka na nwa ya ekweghị abanye n’otu nzuzo kpatara ụmụakwụkwọ ndị ọzọ ahụ ji tie ya ihe.

O kwuru na ọ bụ n’ụbọchị 21 nke ọnwa Nọvemba ka ụlọakwụkwọ kpọrọ ya na-ekwu na nwa ya nọ n’ụlọọgwụ n’ihi na o merụrụ ahụ ebe ọ na-agba bọọlụ.

Mana oge ha zigara mmadụ ka ọ ga hụ ya, onye ahụ kwuru na ahụ o merụrụ karịrị ịgba bọọlụ.

“Ọnụ ya niile na-eji oji, o nweghị ike ịkwụ ọtọ.”

Aha onyonyo,

School closures: Eribeghi m ụgwọ ọnwa kamgbe Maachị n’ihi mmechi ụlọakwụkwọ

Ha mechara tinye ya n’ụgbọelu si Legọs bulata ya Warri ebe ha bi, wee malite inye ya ọgwụgwọ.

Ọ bụ n’ụbọchị 29 nke ọnwa Nọvemba ka Junior gwara nne ya na ọ bụghị bọọlụ ka ọ na-agba mere o ji merụọ ahụ.

O kwuru sị: “Mummy, agabghị m bọọlụ. Adaghị m ada ebe m na-agba bọọlụ”.

Junior kwuru na ha kụrụ ya ihe, gbaa ya ụkwụ, zọọ ya ụkwụ n’ukwu ya, ụmụakwụkwọndị ọzọ gbara ọsọ.

Ndị ahụ tiri ya ihe yiri ya na ndị ọzọ egwu na ha ga-egbu ha ma ha gwa ndị nkuzi ha ihe merenụ.

Mazi Oromoni gwakwara ndị ntaakụkọ Punch na o teela aka ha malitere ịhụta ihe mmekpa ahụ gbasara nwa ha n’ụlọakwụkwọ Dowen College.

O kwuru na ha chọpụtara na ha nye nwa ha ihe oriri ruru puku naịra ise, ọ naghị akarị otu izuụka tupu nrị ahụ agwụ.

Mana nwa ha anaghị ekwe akọrọ ha ihe na-eme nri ha na-ebunye ya.

Ihe ụlọakwụkwọ Dowen College kwuru

Ebe foto si, Dowen College

Ụlọakwụkwọ Dowen College kwuru na ọ bụ n’ụbọchị 21 nke Nọvemba ka ọ dara ada ebe ọ na-agba bọọlụ.

Ha kwuru na ha kpọgara ya ụlọọgwụ ma nye ya ọgwụgwọ nwa mgbe nta tupu ha akpọọ nne ya ka ọ bịa kpọrọ ya

“Ọ tụrụ anyị n’anya oge anyị hụrụ akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ekwu na ọ bụ ụmụakwụkwọ ibe ya tiri ya ihe,” ụlọakwụkwọ ahụ dere.

Ha kwukwara na ha mere nnyocha nke gosiri na onweghị ihe dịka mmekpa ahụ ọbụla dị n’ụlọakwụkwọ ha.



READ SOURCE

Leave a Reply

This website uses cookies. By continuing to use this site, you accept our use of cookies.  Learn more