africa

Anambra Transition committee: Ihe mere Soludo jiri họpụta Ezekwesili na ndị ọzọ


Ndị soludo họpụtara na 'transition commitee'

Charles Chukwuma Soludo ahọpụtala Oby Ezekwesili na ndị ọzọ dịka kọmitii ga-enyefe ya ọchịchị a kpọrọ ‘transition committee’ n’ọkwa ịbụ gọvanọ Anambra steeti.

N’ozi Soludo wepụtara, Oby Ezekwesili ga-arụ ọrụ dịka onyeisioche kọmitii ahụ bụ ndị ga-ahụ na o were ọchịchị n’Anambra Steeti n’ọnwa Maachị afọ 2022.

Otu n’ime ndị ọ họpụtara bụ Lawrence Mefor gwara BBC Igbo ka obi dị ya nakwa ihe mere Soludo jiri họpụta ha.

Mefọr sị na nhọpụta ya na ndị ọzọ bụ ihe ziri ezi maka na o nweghi onye Soludo ga-akpọ oku ka ọ ghara ịza.

Ọ sị na ihe mere e ji họpụta ndị maara nke ekwe na-akụ na ngalaba dị iche iche bụ maka na ịhazi ọchịchị adịghị mfe.

Mefor sị na ha ga-eleba anya na ngalaba dịka akụnaụba, agụmaakwụkwọ, ahụike, azụmaahịa, ụmụnwaanyị, ndị ntoroọbịa dgz ma bunye Soludo uche ihe o nwereike ime ka ọchịchị ya mee ọfụma.

Gịnị ka ‘transition committee’ pụtara na ọrụ ha.

Lawrence Mefor sị na ‘transition’ pụtara ngafe site n’otu ebe banye n’ebe ọzọ, ya bụ “isi n’ọchịchị gafe n’ọchịchị ọzọ”.

ọ sị na ọrụ komitii a bụ ịhụ na ọchịchị nke ochie kọwaara ọchịchị nke ọ hụrụ ka ihe si kwụrụ iji nyere ha aka ịmalite ọrụ na-egbughi oge.

Mefor sị ma emeghi etu ahụ na ọ ga-enye ọchịchị ọhụrụ nsogbu ịmata ọrụ na ha agaghị ka ha ga-esi malite ọrụ ha.

Ọ gakwara n’ihu kwuo na ihe ọzọ komitii a na-eme bụ ibunye uche maọbụ ịtụ arọ ka ọchịchị ọhụrụ ga-esi malite ọrụ.

Na ọ dịziri gọvanọ maọbụ onyeisi ọchịchị n’aka ịṅa komitii a ntị ịgba arọ ha tụnyeere.

Soludo ga-eburu oche ọchịchị n’ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Maachị afọ 2022 site n’aka Willie Obiano chịrịla Anambra afọ asatọ.

Kọmitii a ga-amalite ọrụ ha n’ụbọchị iri na itoolu ruo ụbọchị iri abụọ na abụọ nke Jenuwarị afọ 2022.

Ndị so na kọmitii a gụnyere:

Ebe foto si, Getty Images

1) Mrs Oby Ezekwesili (Chairperson)

2) Prof. Benedict Okey Oramah

17) Chief Collins Chikeluba

18) Engr (Sir) Chris Okoye

19) Prof. (Mrs) Uche Amazigo

20) Barrister Pat. Ikwueto, SAN

21) Dr. Olisa Agbakoba, SAN

22) Barrister Echezona Etiaba, SAN

23) Prof. Offornze Amucheazi, SAN

29) Chief Akachukwu Nwankpo

33) Dr. Greg Ugochukwu Ezeilo

35) Mr. Christian Udechukwu

36) Chinyere Ossy Okoye, Esq

38) Mr. Chijioke Uwaegbute — PWC

40) Mr. Dozie Okpalaobieri

49) Barrister Udu – Former Head of Service

54) Prof. Ifedioramma Eugene-Mary Nwana

56) Ms Prisca-Anne Nwangwu

59) Fred Chukwuemeka Agbata

62) Prof. Nkechi Ikediugwu

71) Comrade Charles Onyeagba

73) Dr. Forster E. Ihejiofor

76) Prof. Sylvia Chika Ifemeje

78) Comrade Churchill Okonkwo

80) Dr. Chinedu Onyeizugbe

Chita na Chukwuma Soludo meriri dịka gọvanọ ọhụrụ Anambra steeti na ntuliaka e mere n’ụbọchị isii ọnwa Nọvemba 2021.

O ritere mmeri n’okpuruọchịchị iri na itoolu n’ime iri abụọ na otu nke steeti ahụ.

Soludo gbara afọ 61 ji ọkọlọtọ APGA zọọ ya bụ ọkwa nke o ji vootu 112,229 merie ogbo ya nke PDP bụ Valantine Ozigbo bụ onye nwetere vootu dị 53,807.



READ SOURCE

Leave a Reply

This website uses cookies. By continuing to use this site, you accept our use of cookies.  Learn more